Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Na Ndị Isi Ọgbakọ Omebe Iwu Ọhụrụ Zukọrọ

Timothy Choji dere ya na bekee

0 279

Onyeisiala Bola Tinubu, Onyeisi oche ọhụrụ nke Sineti Naịjirịa, Godswill Akpabio na Ọkà Okwu, Ụlọ Ndị Nnọchiteanya, Tajudeen Abbas mere nzukọ.

Ndị isi abụọ ahụ na ndị otu ha batara n’ime ụlọ Onyeisiala n’ehihie Tuuzdee, n’oge na-adịghị anya ka emechara ntuli aka na ịṅụ iyi ọrụ ha na Senate na Ụlọ Ndị Nnọchiteanya.

Akpabio na Abbas, ndị e tere mmanụ nọ n’ọkwa atọ na anọ meriri na ntuliaka ha dịka e buru n’amụma.

Site na ha pụta, ọchịchị ọhụrụ na-eji nwayọọ nwayọọ na-eguzobe na ndị isi nke ogwe aka atọ nke gọọmenti dị ugbu a.

A na-atụ anya na Onyeisi ụlọ omebe iwu Sineti na Ọkà Okwu Ndị Nnọchiteanya ga-agwa ndị nta akụkọ steeti okwu na ngwụcha nzukọ mechiri emechi ha na onye ndu Naijiria.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *