Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Ebonyi Ahọpụtala Onye Nkuzi Dị Ka Odeakwụkwọ Steeti

0 304

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ Francis Nwifuru ahọpụtala otu onye nkuzi nwanyị na Mahadum Ebonyi steeti Abakaliki, Prof. Grace Umezurike ka ọ bụrụ odeakwụkwọ gọọmentị steeti ahụ (SSG).

Ruo oge nhọpụta ya, Prof. Umezurike bụ nnukwu onye nkuzi na ngalaba nke Philosophy na Religion na Mahadum Ebonyi State University. .

Ọ bụ nwunye onye kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, Dr Daniel Umezurike.

Nkọwa nke nhọpụta ya, nke dị n’akwụkwọ ozi onye odeakwụkwọ mgbasa ozi nke Nwifuru bịanyere aka na ya, Dọkịta Monday Uzor bịara awa ole na ole ka Gọvanọ ṅụchara iyi na ndị Senior Special Assistant abụọ na 20 Special Assistant.

Nkwupụta ahụ kwuru, sị, “Gọvanọ Ebonyi steeti, onye isi ala, Rt. Hon. Francis Ogbonna Nwifuru anabatala ọkwa Prof. Grace Umezurike ka ọ bụrụ odeakwụkwọ gọọmentị Ebonyi steeti.

“Nhọpụta ahụ na-amalite ozugbo.

“Ọ ga-aṅụ iyi ọrụ na Tuuzde , abalị iri na atọ ọnwa Juun, 2023.”

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *