Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ọbara mgbalielu nwere ike ibutere gị

0 485

Dika Maduka sịrị,”Otu n’ime ihe ọbara mgbalielu nwere ike ibute bụ ọnwụ ike nke a na-akpọ cardiac arrest.”

“Ọ bụghị ndị iro si obodo na-ebute mmadụ ịdaa, nwụọ na-enweghị ihe na-emebu ya. O nwere ike ọ bụrụ akwara na-ekesa ọbara n’ahụ gbabiri n’ike.”

Dọkịta ahụike ọha agụ gara n’ihu kọwa sị, “Ọbara mgbalielu nwere ike imetụta akụkụ ahụ e ji amụ nwa(reproductive system) ọkachasị n’ụmụnwoke.”

” O nwere ike ime ka nwoke ghara ịtụwali nwaanyị ime maọbụ ka ihe o jiri bụrụ nwoke ghara ịrụ ọrụ dịka o kwesịrị.”

Dkta Maduka si kwuo, Ọbara mgbaliego nwere ike ịkpọnwụ akụkụ ahụ mmadụ n’ihi na ọbara anaghị agazi n’ụbụrụ ya dịka o kwesịrị.maọbụ mee ka mmadụ ghara ịhụzị ụzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *