Take a fresh look at your lifestyle.

Osote Onyeisiala Osinbajo ekelela Onyeisiala Buhari Na Agbam Afo Iri Asatọ

Cyril Okonkwo dere ya na Bekee

0 285

Osote onyeisiala Yemi Osinbajo na nwunye ya bụ Dolapo ekelela Onyeisiala Muhammadu Buhari na mmemme ncheta ụbọchị ọmụmụ ya nke iri asatọ ya taa.

N’ime ozi obinyere aka n’onwe ya nke ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Laolu Akande wepụtara, osote onyeisiala dere:

“Obi ụtọ ncheta ụbọchị ọmụmụ nke iri asatọ”, Maazị Onyeisiala!

“Ndụ gị pụrụ iche nke ijere obodo ozi na-enweghị ntụpọ dịka onye agha, onye Gọvanọ, Minista, Onye isi ndị agha na Onyeisiala ugboro abụọ na-egosi na ọ ga-ekwe omume ijere obodo na ndị mmadụ ozi n’eziokwu, na n’achọghị ọdịmma nke onwe” .

“Mụ na Dolly, na ezinụlọ anyị na-ekpere gị ekpere ogologo afọ, obi ụtọ na udo na ezi ahụ ike n’aha Jizọs. Amen,” Ọkammụta Osinbajo kpere.

 

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *