Onyeisiala Naijiria, Muhammadu Buhari ga-anọ n’ụbọchị Tọzdee, Nọvemba 24, 2022 mee njem gọọmentị na Niamey, Rịpọblik nke Niger iji gaa ọgbakọ otu mba Afrịka na-ahụ maka nrụpụta ọrụ na mgbanwe akụ na ụba, yana nnọkọ pụrụiche n’azụmahịa mba Afrịka (African Continental Free Trade Area, AfCFTA).
Onyeisiala nke ga-apụ n’ụtụtụ Tọzdee, ga-agakwa na mmalite akwụkwọ nke akpọrọ; ”Muhammadu Buhari: The Challenges of Leadership in Nigeria” nke e degharịrị n’asụsụ French, nakwa mmepe ”Muhammadu Buhari Boulevard” nke gọọmenti Rịpọblik Niger jiri aha ya hibe.
Mmepe Boulevard na mmalite akwụkwọ French ahụ nke John Paden dere bụ n’ụbọchị Tọzdee ebe ọgbakọ AU bụ na Fraịde, Nọvemba 25, 2022.
A na-atụ anya na Onyeisiala Buhari ga-ekwu okwu n’ọgbakọ African Union nke isi okwu ya gbadoro ụkwụ na “Industrialising Africa: Renewed Commitment Towards an Inclusive and Sustainable Industrialization and Economic Diversification.”
Ọgbakọ ahụ dị elu, nke a na-enwe kwa afọ bụ nke a na-atụ anya na a ga-enwe mkpebi, na-akọwapụta mkpa mmepụta ihe na mgbanwe akụ na ụba n’mba Afrịka.
Abalị iri abụọ nke ọnwa Novemba afọ ọbụla bụ ụbọchị ncheta mmepụta ihe nke Afrịka, nke ọgbakọ ndị isi obodo na gọọmentị nke Afrịka kwekọrịtara n’ọnwa Julaị afọ 1989 na’Addis Ababa mba Ethiopia.
Ndị ga-eso Onyeisiala Buhari mee njem a bụ Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi, Geoffrey Onyeama, Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa, Major-Gen. Bashir Magashi, Mịnịsta na-ahụ maka ụlọ ọrụ, azụmaahịa, Adeniyi Adebayo; Mịnịsta na-ahụ maka ego, Zainab Ahmed; Onye ndụmọdụ nchekwa obodo, Major-General Babagana Monguno na onyeisioche, National Intelligence Agency, Ahmed Rufai Abubakar.
Onyeisiala ga-alaghachi n’Naijiria na Fraịde, Nọvemba 25.
Ike Umenaba
Leave a Reply