Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria Ga-eji Okporo Ụzọ Ụgbọ Oloko Jikọta Isi Obodo Steeti Nile

David Adekunle

0 329

Mịnịsta na-ahụ maka njem n’Naịjirịa bụ Mu’azu Sambo ekwela ndị Naịjirịa nkwa na okporo ụgbọ oloko nke ọgbara ọhụrụ ga-ejikọta isi obodo steeti ọ bụla n’Naịjirịa.

Maazị Sambo kwere nkwa a mgbe ọ na-ekwu okwu n’emume ọgbakọ iri abụọ nke Mahadum Igbinedion, Okada, nke steeti Edo dị na ndịda ugwu Naijiria .

Mịnịsta ahụ mere ka a mata na ezi ebumnuche ọchịchị Buhari ahapụbeghị steeti Edo.

Dị ka mịnịsta ahụ si kwuo, “Atumatu okporo ụzọ oloko anyị ga-ejikọta isi obodo ọ bụla n’Naijiria, onyelaarị njikọ na Benin City site n’okporo ụgbọ oloko nke si Lagos ruo Calabar”.

“Oru ngo ọdụ ụgbọ mmiri Benin nke Gọọmenti Edo steeti nọ n’isi ya na-enweta nkwado siri ike site n’aka Mịnịstrị etiti na-ahụ maka njem na ụlọ ọrụ ndị ọzọ niile na-etinye aka ịhụ na a rụpụtara ya n’oge.”

Ọ bụ ọrụ okporo ụzọ gọọmenti etiti karịrị iri na atọ ndị nọ na nkeji mmezu dị iche iche bụ akaebe ọrụ ọma gọọmenti etiti ma gụnyekwa ọrụ ngo ụlọ ebe obibi.

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *