Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Njem Tọrọ Atọ Ka Ndị Na-Anya Ụgbọ Elu Gbara Abụbụ Ọrụ

0 348

Ihe karịrị njem ụgbọ elu iri abụọ na anọ bụ ihe a kagburu ebe puku kwuru puku ndị njem tọrọ atọ dị ka ndị na-anya ụgbọelu na Kenya Airways PLC (KQNA.NR), otu n’ime ụlọ ọrụ njem ụgbọelu n’Africa malitere abụbụ ọrụ na Satọde, n’agbanyeghị gọọmentị na-agba ha ume ka ha kwụsị ya.

Abụbụ ọrụ ahụ malitere n’elekere isii nke ụtụtụ (0300 GMT) ga-emetụta azụmahịa na ndị njem ntụrụndụ n’otu n’ime ọdụ ụgbọ elu kacha mkpa n’Africa.

Otu ndị na-anya ụgbọ elu na Kenya, KALPA n’aha mkpirisi, kwuru na ndị nlekọta ụlọ ọrụ ahụ jụrụ ige ntị n’atụmatụ ha maka otu ha ga-esi dozie mkpesa ha.

“Ọ dịghị ụgbọ elu ọbụla siri n’ọdụ ụgbọ elu Jomo Kenyatta nke onye otu KALPA kwọọrọ, malite n’elekere isii nke ụtụtụ taa,” Ndị otu ahụ kwupụtara. “Abụbụ ọrụ a ebidogo n’uju ya”

Ụlọ ọrụ ahụ rịọrọ ndị na-eme njem mgbaghara wee kwuo na ọ ga-eme ike ya niile ibelata ihe mgbu, nke nwere ike ịgụnye idegharị ha na ụgbọ elu ndị ọzọ.

Na mbido, ụlọ ọrụ ahụ kwuru na atụmatụ abụbụ ọrụ ahụ bụ nke megidere iwu ma dọọ aka na ntị na o nwere ike idọghachi ha azụ na mgbake ihe mgbu nke COVID-19 butere. Ha kwukwara na ha nwere ike itufu opekata mpe narị nde Shilling atọ (nde Dollar abụọ na ọkara) kwa ụbọchị.

“Ndị na-anya ụgbọ elu achọghị ịhụ ezi ebumnuche ụlọ ọrụ ahụ nwere ebe ha nọ,” Mịnịsta na-ahụ maka njem, Kipchumba Murkomen kwuru n’ụlọ ọrụ telivishọn mnwere onwe nke NTV.

“Ọ bụ ihe dị ka ndị njem puku iri bụ ndị nke a metụtara ruo ugbu a ma ọ bụrụ na ọnọdụ a na-aga n’ihu ọnọdụ njem nlegharị anya ga-adị njọ,” onye mịnịsta ahụ kwuru ma na-agbakwunye na ihe karịrị njem ụgbọ elu iri abụọ na anọ ka a kagbugoro.

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *