Sadiya Umar Farouk bụ mịnịsta na-ahụ maka njikwa ọdachi na Naịjirịa
Ọnụọgụgụ ndị nwụrụla n’ọdachi ide mmiri nke na-aga n’ihu ugbua na steeti dị icheiche na Naịjirịa eruola narị isii na atọ.
Onye kwuru nke a bụ Sadiya Umar Farouk, ji ọkwa Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ enyemaka, njikwa ihe mberede, na mwulite obodo, nke a na-akpọ ‘Minister of Humanitarian Affairs, Disaster Management and Social Development’ na bekee.
O kwuru nke a dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n’Abuja n’ụbọchị Sọnde, ebe ọ nọrọ kwuputa na ihe karịrị ụlọ 200,000 alaala n’iyi n’ihi ọdachi ide mmiri a.
“Ọtụtụ ala ebe ndị mmadụ kọrọ nri alakwaala n’iyi, ndị mmadụ karịrị nde 1.3 enweghịzi ebe obibi n’ihi ọdachi a,” ka Umar Farouk kwuru.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na ya bụ ọdachi abịabeghị n’isi njedebe maka na a na-atụ anya na ide mmiri a ka ga-abịa karịa n’izuụka ndị di n’hu.
Ngalaba gọọmentị na-akọwa maka ihu eligwe bụ ‘Nigeria Meteorological Agency’ na-adọ aka na ntị na ide mmiri a ga-adigide ruo ngwụcha ọnwa Nọvemba na steeti dịka Anambra, Delta, Rivers, Cross River, Bayelsa, na Steeti ndị ọzọ.
Mịnịsta ahụ kwuru na gọọmentị etiti dọrọ aka na ntị maka ọdachi ide mmiri a, “mana ọtụtụ gọọmentị steeti emeghị ihe ọbụla iji kee nkwụcha maka ya, nke kpatara ọtụtụ mbibi nakwa ọnwụ anyị na-ahụ ugbua”.
Ọ gara n’ihu kwuo na gọọmenị amalitela ikesa ọtụtụ ihe enyemaka dịka nri nakwa ihe e ji ebi ndụ, nye ndị ọdachi ide mmiri a metụtara.
Ihe kpatara ọdachia bụ oke mmiri ozuzo nakwa mmepe e mepere ebe a na-eche mmiri a kpọrọ ‘dam’ na mba Kamerun, mana ndị ọkacha mara na-ekwu na ọ bụ adịghị nkwadebe nakwa na gọọmentị etinyeghị ihe mgbochi mere ọdachia ji ka njọ.
Leave a Reply