Nwunye onye isi ala Naijiria na-akwado inye ụmụaka a mụrụ ọhụrụ nani mmiri ara nne ha.
Timothy Choji, Abuja dere ya na bekee.
Nwunye onye isi ala Naijiria na-akwado inye ụmụaka a mụrụ ọhụrụ nani mmiri ara nne ha.
Nwunye onye isi ala Naijiria, Aisha Buhari, ekwela nkwa ịkwado na ịkwalite umunwanyi inye ụmụaka ha muru ohuru ara site na agụmakwụkwọ gbasara nke a oge niile na ime ka ọ pụta ìhè na ikowa uru ahụike di na ya.
Ya mere, ọ gwala ndị nna, ndị ezi-na-ụlọ na ọha mmadụ ka ha na-akwado usoro a mgbe niile.
N’ikwu okwu n’Abuja na mmemme nke a na State House Clinic haziri iji mee emume izu nke I ji ara zuu nri ụwa nke afọ 2022, nwunye onye isi ala, bụ Dr. Rukayyatu Gurin nọchitere anya ya, onye enyemaka pụrụiche nke Onye isi ala na nchịkwa ụmụ nwanyị, , kwenyesiri ike na nkwa ya n’ịhụ na ọtụtụ ezinụlọ na-anabata inye ụmụ ọhụrụ ara.
Leave a Reply