Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweoji wetara ezinaụlọ ndị mmadụ 15 nwụrụ anwụ N48.5m.

0 370

Ihe karịrị nde naira iri anọ na asatọ ka ewepụtara ezinaụlọ ndị ọrụ uwe ojii nwụrụ anwụ ,bụ ndị tụfuru ndụ ha mgbe ha na-arụ ọrụ.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi onye uweojii na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze, ASP Ramhan Nansel binyere aka, ma nye ndị nta akụkọ na Lafia.

Dịka nkwupụta a si kwuo, Kọmishọna ndị uweojii na steeti Nasarawa, Adesina Soyemi, gosipụtara ego ndị a n’aha Inspector-General nke ndị uweojii.

Ka ọ na-enye akwụkwọ ozi ndị ahụ, Kọmishọna ndị uwe ojii kelere onye Inspector-General nke ndị uwe ojii maka inye ezinaụlọ ndị uwe ojii nwụrụ anwụ aka, ma dụọkwa ndị erite uru ka ha tinye ego ahụ n’ọrụ ga-erite uru nke ga-eme ka ndụ ezinụlọ ha ka mma.

N’ịgbakwụnye na mmegharị ahụ bụ atụmatụ nke Inspector-General of Police, ”Group Life Assurance” na-akwado ịkwalite ikike na ọnọdụ ndụ nke ezinaụlọ ndị ọrụ uwe ojii tụfuru ndụ ha n’ọrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *