Onyeisiala Naijiria bụ,Muhammadu Buhari ga eme njem taa bụ Tuuzde abali iri atọ nke onwa Mee,site na Abuja ruo Madrid nke mba Spain,dika onyeisiala mba Spain bụ,Pedro Sanchez kpokuru ya.
Na oge njem a onyeisiala bụ, Buhari ga eje nwe nzukọ ya na onye Head of State of the Spanish nation bụ, His Majesty King Felipe VI.
Prezidenti Buhari ga enwe mkparita uka ya na onyeisiala mba ahu,bụ n kw ha ga ebinye aka n’akwukwo maka ezi nmekorita dina etiti mba abuo a.
Ebe ha ga eleba anya gunyere inyefe ndi aturu nkporo,inye aka n’ikpe ziri ezi,okwu omenalal,ibu agha megide mpu nakwa inwe ezi nchekwa.
Prezidenit Buhari ka ndi so ya mee njem a gunyere onye Minista nke n’ahu maka ihe na eme na mba ndi ozo bu, Geoffrey Onyeama; onye Attorney General of the Federation ma buru Minista nke ikpe bu Justice, Abubakar Malami; Minista nke azum ahia bu, Otunba Adeniyi Adebayo; Minista mgbasa ozi na omenala bu, Alhaji Lai Mohammed; Minista nke ihe n’eme nala anyi bu, Rauf Aregbesola; Minista nke ndi ntorobia na egwuriegwu bu, Sunday Dare; nakwa Minista nke steeti na ahu-ike bu, Olorunnimbe Mamora.
Onyeisiala ka ana le anya n’oga aloghachi na ala anyi n’ubochi Fride bu abali ato nke ọnwa Juun.
Leave a Reply