Take a fresh look at your lifestyle.

Onye isi ala Buhari kpọpụrụ ndị minista chọrọ ịsọ mpi ka ha gbaa arụkwaghịm.

0 436

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari enyela ndị otu ya niile chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka 2023 ka ha gbaa arụkwaghịm nhọpụta ha na Mọnde, Mee 16, 2022.

Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala, Lai Mohammed kpugheere nke a nye ndị nta akụkọ na-ahụ maka ụlọ ọrụ steeti na ngwụcha ọgbakọ ndị minista ụbọchị Wenezde nke Onyeisiala Buhari duziri.

Ọ sịrị: “Iwu m nwere n’aka Onye isi ala bụ ịkpọsa na ndị otu Federal Executive Council na-azọ ọkwa ọkwa ga-ahapụrịrị ọrụ nhọpụta ndị minista ha  ozigbo ma ọ bụ tupu Mọnde 16th nke Mee 2022.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *