Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ndị uweojii siri kụnye m ajụ n’isi – Onyeisi Civil Defence Imo Steeti

0 705

Akụkọ na-ekwu na ndị ọrụ uweojii wakporo isiụlọọrụ ndị Civil defence dị n’Owerri ma gbagbuo mmadụ abụọ ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

Onye ntaakụkọ sị na nke a mere na mgbede ụbọchị Mọnde 25 Eprel 2022 mgbe ọtụtụ ndị ọrụ civil mechichara ọrụ.

Ihe onyonyo pụtara na soshal midia gosiri ka mmadụ abụọ nwụrụ anwụ tọgbọ n’ala ebe otu onye ọbara juru ahụ nọ n’ebe akwa.

Kedụ ihe ndị ọrụ NSCDC na-ekwu?

EBE FOTO SI,CIVIL DEFENCE/FACEBOOK

Onyeisi otu NSCDC n’Imo Steeti bụ Michael Ogar na-ebo ndị Police ebubo na ha wakporo ya.

Ọ bụ dịka Ogar na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka ka o kwuru nke a.

O kwuru sị, “Ndị NSCDC jidere otu onye aha ya bụ Nonso Ezenwanne n’ihi na ogbochiri ụgbọala m na nke ndị na-eso m dịka anyị si Egbema ebe ọkụ gbara alọta”.

O kwuru na ha jidere ya n’ihi na ọ kwuru na ọ bụ onye uweojii kama ha hụrụ Kadị njirimara olemaole n’ahụ ya mere ha jiri yowe ya enyo.

Ogar kwuru na agbanyeghi na ha mechara hapụ ya na Ezenwanne gara n’ihu soro ụgbọala ha n’azụ ruo Owerre ebe ọ nọchịrị ha ụzọ ma wepụta egbe Pistọl.

Kama o kọwara na ndị otu ya napụrụ ya egbe ahụ ma nwuchie ya.

O kwuru na ọ kpọtụrụ onye nnọchite anya kọmịshọna uweojii Imo Steeti bụ DCP Giwa ka ọ kpesara ya maka agwa Ezenwanne kama ọmụtaghị mkpụrụ ọbụla.

Ogar kwuru sị, ” Mgbe m kpọrọ kọmịshọna nwa mgbenta DCP Giwa ka m kpesere ya maka ihe mere, ọ gwara m na ezipụla Ezenwanne ma zịga ya Kaduna”.

O kwuru na ọ bụ mgbe ọ na-aga ịhụ onyeisi MOPOL 18 ka ndị uweojii wakporo ya.

Ogar kwuru sị, ” Ihe ruru ụgbọala asatọ nọchịri anyị ụzọ were bido gbawa egbe n’elu, ha gbakwara ụgbọala m egbe, kpọpụta m ma were osisi na ụtalị tiem ezigbo ihe”.

O kwuru na ndị a kpọrọ ya gaa n’isi ụlọrụ ha ma bido na-eti ya ihe ruo awa atọ tutu osote kọmịshọna na-ahụ maka ọrụ ndi uweojii abịa zọpụta ya.

Ogar kwuru na ọ bụ mgbe ọ lọghachiri n’ụlọọrụ ha ka ọ hụru ihe ndị uweojii a mebiri ma chọpụta kwa na-agbara ndị otu ya abụọ egbe.

Kedụ ihe ndị uweojii na-ekwu?

Ndi ntaakuko kpọrọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo Steeti bụ Mike Abattam n’ekwe ntị ya kama ọzaghị.

Dịka o siri dị, ndị uweojii ekwubeghị ihe ọbụla maka ihe mere.

Kedụ ihe butere nke a

Otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na ndị uweojii a wakporo ụlọọrụ ndị civil defence ịbịa zọpụta onye otu ha a kpọchiri na nga n’ụlọọrụ ahụ.

Ọ sị na a nwuchiri onye uweojii ahụ mgbe ọ gbabara n’ogogo ụgbọala ndị bu onyeisi ndị civil defence n’Owerri mgbe ha si n’Abaezi Egbema bụ ebe ọkụ mmanụ agbidi adịgboroja gbagburu ndị mmadụ na-alọta.

Ọ sị na ihe mere n’ebe a kpọrọ ;control post dị n’owerri, na nwoke ahụ na-eyighi uwe ndị uweojii ji ụgbọala ya na-eso ụgbọala onye ndị civil defence n’azụ.

Nke ahụ mere onyeisi ndụ civil defence jiri nye iwu sị ka a nwuchie nwoke ahụ na mgbede Sọnde ahụ.

“Na mgbe echi ya bụ Mọnde ka ndị uweojii wuchiri n’isiụlọọrụ ndị Civil defence ma malite ịgba egbe ma na-eti ndị ọrụ civil defence bụ ụmụnwaanyị ihe, ha gbagburu mmadụ abụọ ma merụọ ọtụtụ ndị ahụ.

Kedụ ihe bụ ọrụ ndị uweojii?

EBE FOTO SI,NIGERIAN POLICE

Ndị uweojii bụ otu n’ime ngalaba nchekwa Naịjirịa e hiwere kpọmkwem n’afọ 1960, mgbe Naịjirịa nweere onwe ha n’aka mba Briten.

Tupu nwereonwe ahụ, e nwekwara ndị uweojii nọ n’ọrụ mana a gbanwere aha ha ka ọ bụrụ ‘Nigerian Police Force’ (NPF).

Ụfọdụ ọrụ e ji maara ha gụnyere;

Igbochi mpụ, ichekwa ndụ, ichekwa akụnaụba, iweta udo n’obodo, inwuchi ndị dara iwu maọbụ mere mbụ, ịme nyocha banyere mpụ dgz.

Kedụ ihe bụ ọrụ ndị ‘civil defence’

EBE FOTO SI,NIGERIAN CIVIL DEFENCE

Civil Defence bụ otu n’ime ngalaba nchekwa na Naịjirịa e hiwere n’afọ 1967 n’oge ụagha Biafra.

O mechara gbanwee ma bụrụ Nigerian Security and Civil Defence Corps (NSCDC) n’afọ 1970.

Ụfọdụ ọru ha na-arụ gụnyere;

Iwete udo n’obodo, inyocha ndị na-esi mmanụ agbidi adịgboroja, inwuchi ndị mere mpụ ma ha o ji ikike maọbụ ha ejighi ikike, inyocha ụlọọrụ nchekwa ndị mmadụ nwee, ịkpachi akụrụngwa ndị e ji mee mpụ, ịnyocha ọrụ otu okpukperechi dị iche iche na-arụ, ibuagha megide ndị otu nzuzo dgz.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *