Take a fresh look at your lifestyle.

Austin  Judy mụụrụ Yul Edochie nwa

0 641

Yul Edochie na-eme ejije Nollywood depụtara n’akara soshal midia ya.

Ọ depụtara ka ụwa bia hụrụ akataka nwa nwoke nwunye ya nke abụọ aha ya bụ Judy Austin mụrụ ya.

O kwuru na aha nwa ahụ bụ STAR DIKE MUNACHIMSO YUL – EDOCHIE.

N’ọnụ ya, “oge eruola mgbe ụwa kwesiri ịmata nwa m nwoke, onye mụrụ ya bụ nwunye m nke abụọ bụ Judy Austin, @judyaustin1 mana ahụrụ nwa m nwoke n’anya etu m si hụ ụmụ m ndị ọzọ n’anya.”

N’okpuru ihe ahụ Yul Edochie depụtara ka ahụrụ ebe nwunye ya bụ May Yul-Edochie dere na “chukwu ga-ekpe Yul na Judy ikpe.”

Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ bido kwuwe maka ihe a Yul Edochie depụtara.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *