Take a fresh look at your lifestyle.

Etu m si zute di m bụ Gọvanọ Akeredolu – Betty Anyanwu

0

Nwunye Gọvanọ Rotimi Akeredolu nke Ondo steeti bu Betty Anyanwu Akeredolu etiwaala akioyibo nsugbe banyere njem ya na alụmdinanwunye.

Na mkparịtaụka ya na ndi ntaakụkọ Igbo nwere, Betty kọwara etu o siri zute di ya, mmerikọta ndị Igbo na ndị Yoruba nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ sị na o zutere di ya n’Enugwu na kọwaa na ha hụrụ onwe ha n’anya ngwa ngwa ha zutere, mgbe ha ji otu afọ efe ala nna ha a kpọrọ ‘Youth Service’.

“Mgbe a bịara ịlụ m, ndị ezinaụlọ m na-atụ ụjọ maka a na-eche na ndị Yoruba na-alụkarịa otu nwaanyị, mana di m gosiri ha na ọ bụ ‘stereotype’ nkịtị” ka o kwuru.

Mgbe Rotimi na Betty mere agbamakwụkwọ ha

Ihe ọzọ o kwuru okwu maka ya bụ etu o si rịa ọrịa akpụ ara bụ ‘Breast Cancer’.

Ọ sị na mgbe ọ chọrọ ikwuputa ya ka ndị mmadụ mara, na Dọkịnta na-agwọ ya kụjara ma sị ya emele nke ahụ.

Ọ kọwara na ọ gara n’ihu malite ụlọorụ ya iji gbasa ozi nakwa ọzụzụ maka ọrịa ahụ n’agbanyeghi na ụmụ nwaanyị ibe ya enyeghi ya nkwado.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *