Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere anyị ji kpebie ibepụ aka nwata ọnwa abụọ nna ya kụrụ ihe – Ndị Dọkịnta

0 453

Ndị dọkịnta n’ụlọọgwụ FMC dị n’Owere akọwaala ihe ha ji kpebie ibepụ aka nwatakịrị dị ọnwa abụo, dịka akụkọ kwuru na ọ bụ nna ya kụjiri ya aka.

Dọkịnta letara nwata ahụ kwuru na ọ bụ n’izuụka gara aga ka a kpọtara nwatakịrị ahụ n’ụlọọgwụ, wee bo ebubo na nna ya kụrụ ya ihe n’ihi na akwa ọ na-ebe n’ime abalị na-enye ya nsogbu.

Iheukwumere Onyenwe, onye ọkachamara na ngalaba ahụike gbasara ọkpụkpụ, so n’otu ndị dọkịnta letara nwata ahụ.

“Ndị kpọtara ya kwuru na oge nna nwata ahụ hụrụ na ọkpụkpụ aka nwata ahụ gbajiri, o weere akwa kegide ya, ọ nọọ ụfọdụ ụbọchị tupu a chọpụta na aka ahụ na-aza aza,” otu n’ime ndị dọkịta ahụ kwuru.

“Ọ bụzi oge ahụ ka e butere ya na FMC, anyị wee chọpụta na o nweela ‘gangrene’ n’aka ahụ niile. Mana oge ahụ, ọ dịla njọ nke ukwuu, onweghịkwa ihe anyị nwere ike ime iji zọpụta ya.”

“Ya mere anyị ji tụnyere ha alọ ka e bepụ aka nwata ahụ iji zọpụta ndụ ya ma gbochie nje ịbanye n’ọbara ya.”

‘Gangrene’ bụ mgba akụkụ ahụ mmadụ nwụrụ n’ihi na ọbara anaghị erute ebe ahụ, maọbụ n’ihi nje bacteria.

Ọ na-emekarị n’aka maọbụ n’ụkwụ, tinyere mkpịsị aka na mkpịsị ụkwụ.

Dọkịta a gara n’ihu kwuo na nne nwata ahụ ekwebughi ka e bepụ nwa ya aka, mana oge a kọwaara ya na ọ bụ ihe ka mma iji zọta ndụ nwata ahụ, nna nne ya bịara nye nkwado tupu ha agaa n’ihu.

O kwuru na onweghị onye mazi ebe nna mụrụ nwata ahụ nọ ugbua n’ihi na ọ gbaala ọsọ. Ọ gara n’ihu kwuo na a na-eche na nwoke ahụ na-aṅụ ọgwụ ike.

Ọ kọwakwara na ọ bụrụ na ọnya ebe e si bepụ nwata ahụ aka lachaa nke ọma, e nwereike itinyere ya aka ‘prostethic’ n’ọdịnihu.

Banyere ego ụlọọgwụ na ihe ndị ọzọ, dọkịta kwuru na enwere ụfọdụ ndị otu na-arụ ọrụ ebere nyerela nwata ahụ aka, mana ọtụtụ ihe ndị ọzọ fọdụrụ bụ ngalaba ụlọọgwụ ahụ a kpọrọ ‘social welfare department’ ga-ekwu maka ya.

Ọtụtụ otu na-ahụ maka ikike dịịrị onye akpọkuola gọọmentị Imo steeti, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ka ha nwuchie otu nwoke a sị kujiri nwa ya aka nke mere e jiri bepụ aka ahụ.

Dorothy Nnaji, bụ onyeisi otu jikọrọ ndị ntaakụkọ ụmụnwaanyị bụ Nigeria Association of Women Journalists (NAWOJ), nke ngalaba Imo Steeti, gbara ama sị na nwoke a mere nke a n’ihi na nwa ya ahụ nọ na-ebe akwa.

Akụkọ sị na nwoke a ama dịka Confidence Amatobi dị afọ iri atọ na otu, nne nwa ahụ a ma dịka Favour dị afọ iri abụọ, ebe nwa ahụ bụ Miracle dị naanị ọnwa abụọ.

Amatobi bụ onye obodo Amurie dị n’okpuruọchịchị Isu, Imo steeti.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *