Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị omekome awakpuru ndị ụka Anglịkan na Nnewi?

0 395

Anglịkan Dayọsis nke Nnewi, Anambra steeti ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ tọrọla ụfọdụ ndị ụlọụka ha na ‘mwakpo’ mere n’ụbọchị ụka, 23 nke ọnwa Ọktoba, 2022.

Ọnụ na-ekwuru ha ma bụrụkwa odeakwụkwọ Dayọsis ahụ bụ Ven. Dkt. Godfrey Mortanya, gwara ndi ntaakuko Igbo na ndị ojiegbe ahụ ebughi ndị otu ha n’obi, na ha awakpoghi ha.

O kwuru na ihe mere bụ na ndị ojiegbe ahụ ji ụgbọala ọ dị ka ha anapụtara n’aka mmadụ wee na-agba ọsọ, mana n’ihi na okporo ụzọ ahụ adịghị wara wara, ụgbọala ha kpọkanyere na nke ndị ụka ha.

O kwukwara na ya bụ ụgbọala bu ndị ọrụ ngalaba mgbasaozi Dayọsis ha mgbe ya bụ ihe mere.

Ven Mortanya kwuru na ndị ojiegbe ahụ nọ na-akwa mgbọ, nke mechara tụọ onye ọkwọụgbọala bu ndị ọrụ mgbasaozi ahụ.

O kwukwara na enweghi onye ọrụ ha atọrọla dịka ha gbapụrụ ọsọ n’ihi ụjọ ihe mere.

Nke a na-abịa dịka akụkọ fegharịrị na soshal midia kwuru na ndị ojiegbe a na-akpọkarị ‘unknown gunmen’ wakporo ma tọrọ ụfọdụ ndị ụlọụka ahụ nọ n’ụgbọala e dere ‘Bishop’s court’ n’ahụ ya.

Ndi ntaakuko Igbo kpọtụrụ Tochukwu Ikenga, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, onye kwuru na ha anatabeghi akụkọ ọbụla gbasara ya bụ ihe mere.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *