Otu March and March Movement na-akpọ oku megide ndị si ụzọ megidere iwu abata mba, amalitela ime ngagharịiwe na Pretoria mba Saụt Afrịka.
Ngagharịiwe ahụ na-abịa dịka mwakpo ‘xenophobia’ e mere megide ndị isiojii mba Afrịka ndị ọzọ na mba Saụt Afrịka.
Ndị ngagharịiwe ahụ ji osisi ma burukwa ọtụtụ akwụkwọ e dere “March and March till we win. Ọ bụrụ na iweghara mba m bụ mwakpo xenophobia, ka m bụrụ onye na-eme mwakpo xenophobia”.
Nke bụ eziokwu bụ na amabeghị ihe kpatara ngagharịiwe ahụ, video na-fegharị na soshal midia nke BBC na-amabeghị ebe o si, kwuru na ha na-akpọ oku ka ndị si mba ọzọ bịa Saụt Afrịka hapụrụ ha ala ha iji nye ndị Saụt Afrịka ohere inweta ọrụ.
Ngagharịiwe a na-abịa dịka ndị Naịjirịa abụọ nwụrụ site na mwakpo ndị ahụ.
Onyeisi ndị Naịjirịa bi na Saụt Afrịka bụ Olaniyi Abodedele, gwara ndi ntakuko na ọ bụ eziokwu na ndị Naịjirịa abụọ ahụ nwụrụ na mwakpo ahụ a wakporo ndị isiojii mba Afrịka ọzọ bi na Saụt Afrịka.
Leave a Reply