Take a fresh look at your lifestyle.

Popu Leo XIV ga-aka ụka ‘Mass’ n’Angola dịka njem ya n’Afrịka na-aga n’ihu

0

Onyeisi ụka Katọlik n’ụwa niile bụ Popu Leo XIV ga-aka ụka ‘mass’ dị nsọ n’obodo Kilamba nke mba Angola n’ụbọchị Sọnde 19 Eprel 2026 dịka njem mbụ ya n’Afrịka na-aga n’ihu.

Dịka ụlọmgbasa ozi ‘Vatican News’ si kwuo, Popu Leo ga-agakwa njem nleta n’ebe a ma ama na mba ahụ dịka ‘Shrine of Muxima, ebe ọ ga-edu ndị ụka Katọlik kwere ekwe n’ekpere ‘Rosary’.

Na Mọnde, ọ ga-aga Saurimo, ebe ọ ga-eleta ndị agadi ma kaa ụka ‘Mass’, tupu ọ laghachi Luanda, iji mechie nleta ya n’Angola.

N’ụtụtụ Tuzde, a na-atụ anya na Popu ga-aga Equatorial Guinea bụ ebe ikpeazụ ọ ga-akwụsị njem ndịozi ya nke mbụ n’Afrịka.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *