Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga-ezute ndị isi mba ụwa n’ọgbako World Econonmic Summit a na-eme na Davos dị na mba Switzaland.
Akụkọ kwuru na a na-atụ anya na Onyeisiala Trump na ndịisi mbaụwa ga-enwe mkparịtaụka gbasara ‘Greenland’.
Mgbe Onyeisiala Trump na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka, ha jụrụ ya etu o siri dị njikere ịga nweta ‘Greenland’, ọ zara, sị: “Ị ga-achọpụta”.
Minista ụlọọrụ mmepụta ihe na ‘Greenland’ bụ Naaja Nathanielsen gwara BBC na ha aghọtaghị ihe mere Trump ji achọ inwere ha ma mee ka o doo anya na ha “achọghị ịbụ ndị Amerịka”.
Cheta na Onyeisiala Trump yiri egwu na ọ ga-etinye tarifu pasenti iri na “mbubata niile nakwa ngwaahịa” si mba asatọ dị na Yuropu site na mmalite Febụwarị ma ọ bụrụ na ha gbochie atụmatụ ya iweghara mpaghara Greenland.
Leave a Reply