Mkpuchi Na Eme Ozugbo Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa nkeji 5 gara agaỤlọikpe achụpụla Abure dịka onyeisioche ‘Labour Party’ nabata Usman
Ụlọikpe ekwuola na ọ bụ Nenadi Usman bụ onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘Labour Party’ị ma chụpụ Julius Abure.
Ọkaikpe Peter Lifu nke Úlọikpe Ukwu dị n’Abuja mere nke a ma wepụ ndị niile nwere ọkwa n’oge ọchịchị Julius Abure.
Ụlọikpe gwara INEC ka ọ nabata Nenadi Usman dịka ndị ọchịchị nchere oge otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Lebọ patị.
Ọkaikpe Peter Lifu gbadoro ụkwụ na mkpebi ikpe Úlọikpe Kachasị na Naịjirịa nke abalí anó nke ónwa Eprelụ, afọ 2025 nke kpebiri na sịnetọ Esther Nenadi Usman bụ onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘Labour Party’.
Ọ gwara INEC na ọ bụ Nenadi bụ onyeisi nchere oge nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ ruo na ha eme ọgbakọ wepụta ndị isi ha.
Leave a Reply