Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Anambra steeti ewepụla ego n’ụgwọọnwa ndị ọrụ n’ọnwa Febrụwarị

0 121

Gọọmenti Anambra steeti ewepụla ego n’ụgwọ ọnwa Febrụwarị nke ọtụtụ ndị ọrụ.

E wepụrụ ego n’ụgwọ ọnwa ha maka na ha abịaghị ọrụ n’ụbọchị Monde.

Gọọmenti steeti ahụ machiburu ịnọ n’ụlọ n’ụbọchị Monde ma dọọ ndị ọrụ bekee aka na ntị na ọ ga-abụzị,”onye arụghị, ọ gaghị eri”.

Kọmishona mgbasaozi na steeti ahụ bụ Law Mefor kwuru na ozi o wepụtara sị,“Achọrọ m ka onye ọrụoyibo ọbụla mara na anyị na-ahụ mbọ ha.”

Ọ gara n’ihu kwuo, “Anyị ji ndị Anambara ụgwọ ịhụ na eji ego ha eme ka o kwesịrị, ọbụladi ma ọ gaeme ka mee ihe ga-afụ ụfụ ime.”

Mefor gwakwara ndi nta akuko Igbo n’ekwentị na “etu e si ewepụ ego ahụ n’ụgwọ ọnwa ha bụ a gbakọọ mọnde ole onye ahụ abịaghị, e wepụ ihe ọ pụtara n’ụgwọ ọnwa onye ahụ”.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ mkpebi gọọmenti Anambra dịka etu a ga-esi kwụsị adịghị abịa ọrụ n’ụbọchị monde.

Mana mgbe BBC jụrụ Mefor na a na-ewepụ ego n’ụgwọ ọnwa ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-arụrụ gọọmentị ọrụ ka ọ sara sị “amaghị m maka nke a, mana ọ bụ kọmịshịọna na-ahụ maka akụnụba ga-ama na ha e na-ewepụ ego”.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *