Take a fresh look at your lifestyle.

Mmebe iwu maka nri:Deborah O. N. Odoh, Onye Odeakwụkwọ (FMBEP)

chigo deziri ya n'igbo

0 17

Deborah O. N. Odoh, Onye Odeakwụkwọ  nke  ngalaba usoro esi rie ego na echiche maka mepe obodo(FMBEP),   kọwara nnyocha na mmeghari a na-eme ugbu a n’ime mmebe iwu maka nri (2016–2025) dị ka otu ihe dị oke mkpa n’ọgbakọ mgbalị Naịjirịa iji mee ka nchedo nri na nri bara uru sikwuo ike.

O kwuru nke a mgbe ọ na-enye okwu mmeghe ya n’ọgbakọ Steering Committee Meeting maka nnyocha na mmeghari Iwu Nri na Nri Bara Uru na Atụmatụ Mmejuputa ya.

Dị ka o si kwuo, a na-eme nnyocha a, site n’itinye aka nke ọtụtụ ndị metụtara ya, iji mepụta atụmatụ nduzi nke afọ iri (2026–2035) ga-eduga mmemme nchedo nri na nri bara uru n’ogo mba na steeti.

A tụrụ anya na iwu e gbanwere ga-akwalite iri nri dị mma, dozie ụdị erughị nri niile, ma melite ọnọdụ nri na ahụike nke ndị kacha adịghị ike—karịsịa ụmụ nwanyị, ụmụaka, ndị ntorobịa, na ndị agadi.”Odoh kwusiri ike na, nke a.

O kwuru na ebumnuche nzukọ a bụ ileba anya n’akwụkwọ iwu a gbanwere tupu ewebata ya n’ihu National Council on Nutrition, nke a tụrụ anya na ọ ga-eme na 28 Jenụwarị 2026.

O keleere nkwado jikọrọ ọnụ nke Ministries nke gọọmenti etiti na steeti, ndị mmepe, ndị na-enye ndụmọdụ, òtù obodo (CSOs), ngalaba onwe ya, mahadum, na ndị mmekọ dị ka GAIN, maka nkwado ha na-aga n’ihu n’oge niile a na-eme nnyocha a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *