Take a fresh look at your lifestyle.

A nwụchiela dọkịta abụọ maka ọnwụ ụmụaka ọhụrụ itoolu

0 371

A nwụchiela ndị dọkịta abụọ dịka ụmụaka ọhụrụ itoolu nwụrụ n’otu ọnwa n’ụlọọgwu ebe a na-ana nwa dị na Siberia, mba Rọshịa.

Ụmụaka ndị a nwụrụ n’oge e nwere ezumike afọ ọhụrụ, dịka ozi si n’aka ndị nnyọcha si kwuo.

Ọnụ na-ekwuru kọmiti na-ahụ maka nnyocha nke mba Rọshịa bụ Svetlana Petrenko kwuru sị,“A mụrụ ụmụaka ndị a nile n’ụlọọgwụ’Novokuznetsk Maternity Hospital’ n’agba abalị mbụ na abalị 12 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2026.”

Ekwubeghị ihe gburu ụmụaka ndị a mana akụkọ ahụ akpalitela iwe ọha ndị Rọshịa

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *