Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmenti Legọs Steeti amalitela ime nnyocha maka ọnwụ nwa Chimamanda Adichie

0 378

Gọọmenti Legọs Steeti amalitela ime nnyocha gbasara ebubo ezinaụlọ nwaafọ Naịjirịa na-ede akwụkwọ bụ Chimamanda Adichie boro sị na ọ bụ amaghịeme ndị ọrụ ahụike kpatara ọnwụ nwa ya nwoke.

Onye ndụmọdụ Gọvanọ Legọs Steeti n’okwu ahụike bụ Dọkịta Kemi Ogunyemi kwuru na mịnịstrị ahụike steeti ahụ na-eme nnyocha iji mara ihe kpatara ọnwụ Nkanu Nnamdi.

Dọkịta Ogunyemi kwuru na onye maọbụ ndị ọbụla a chọpụtara na ha emeghị ihe ha kwesịrị ime maọbụ ghara iso usoro iwu kwadoro, nke butere ọnwụ nwatakịrị ahụ, ga-enweta ntaramahụhụ dịka iwu si kwuo.

Ọ gwara ọhanaeze ka ha ghara ifesa ozi ụgha maọbụ gee ntị n’akụkọ ụfọdụ banyere ọnwụ Nkanu Nnamdị dịka nnyocha na-aga n’ihu.

Ka ọ dị ugbua, Chimamanda Adichie enyela ụlọọrụ Euracare mkpụrụ ụbọchị asaa iji wepụta ozi niile gbasara nwa ya nwoke nwụrụ n’izuụka gara aga.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *