Take a fresh look at your lifestyle.

Anyị ga-eyigharị ụbọchị a ga-atọhapụ ndị Izrel e ji eji – Hamas

0 243

Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha Hamas ekwuola na ndị otu ahụ ga-agbatị oge ha ga-eji tọhapụ ndị Izrel ha ji eji ma kwuo na nke ahụ bụ n’ihi na Izrel nupụrụ isi na nkekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ.

E kwesịrị ịtọhapụ mmadụ atọ e ji eji na Gaza n’ụbọchị Satọde iji gbanwerịta ọtụtụ ndị Palestine a tụrụ mkpọrọ n’Izrel.

Minista na-ahụ maka nchekwa n’Izrel bụ Israel Katz ekwuola na ozi ahụ si n’aka ndị Hamas bụ ‘mmetọ nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ”.

Otu onye a ma ama na-akwado Izrel bụ Donald Trump ekwuola ka akagbuo nkwekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ ahụ ọ bụrụ na “agaghị atọhapụ mmadụ niile e ji eji na Gaza n’ụbọchị Satọde”.

“Aga m asị na e kwesịrị ịtọhapụ ha n’elekere iri na abụọ nke etiti ụbọchị na Satọde… ha niile, ọ bụghị a tọhapụ ụfọdụ a ghara ụfọdụ maọbụ a tọhapụ otu taa, echi a tohapụ abụọ maọbụ atọ,” ka Trump kwuru.

Ka o sinadị, ọ sịrị “Ana m ekwu maka onwe m. Izrel nwere ikike ime ihe dị ha mma.”

Ụmụafọ Izrel iri asaa na atọ (73) e jichiri oge Hamas wakporo Izrel n’abalị asaa nke onwa Ọktoba 2023 tinyere atọ ndị nke ọzọ ha jichiri afọ iri gara aga ka nọ na Gaza.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *