Take a fresh look at your lifestyle.

Togo na Benin Republic na-enwe ọkụ latrik oge niile site na Naịjirịa – TCN

0 486

Sule Abdulaziz bụ nnukwu onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ọkụ latrik Naịjirịa bụ Transmission Company of Nigeria (TCN) ekwuola na mba Togo na Bene Rịpọblik na-enwe ọkụ latrik oge niile site na Naịjirịa.

“Anyị na-enye Togo, Bene na Nijie ọkụ. Ha na-enwe ọkụ latrik oge niile, nke ha na-akwụ ụgwọ ya,” ka Abdulaziz kwuru oge a na-agba ya ajụjụ n’ụlọmgbasaozi Channels.

Oge a jụrụ ya ihe mere ọtụtụ ndị Naịjirịa anaghị enwe ọkụ etu ahụ, ọ sịrị na ndị Naịjirịa na-enwe ezigbo ọkụ mana ọ bụghị ebe niile.

O kwuru na ndị nọ n’ogogo Band A na-enwe ọkụ latrik ihe ruru elekere iri abụọ maọbụ iri abụọ na abụọ kwa ụbọchị.

Abdulaziz gbakwunyere na a ga-amalite na-enwe ezigbo ọkụ n’ime afọ ise na-abịa n’ihi na Minista ọhụrụ na-agba mbọ maka nke ahụ.

Onyeisi TCN ahụ kọwakwara na akụrụngwa ha na-emebi kwa mgbe kwa mgbe bụ nsogbu ọzọ ha nwere, n’ihi na ọ akarịala afọ iri ise (50) a malitere iji ha eme ihe.

Abdulaziz kwuru na ụgwọ ọkụ latrik dị ọnụ ala na Naịjirịa ọ bụrụ ma e ji ya tụnyere mba Afrịka ndị ọzọ dịka Bọkịna Faso, Senegal na Nijie Rịpọblik.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *