Take a fresh look at your lifestyle.

Nathaniel Bassey agbaala ndị kwuru na ọ bụ ya mụrụ nwa Mercy Chinwo akwụkwọ n’aka ndị uweojii

0 243

Otiegwu a ma ama bụ Nathaniel Bassey edegaara onyeisi ndị uweojii akwụkwọ ka o nyochaa ma maa mmadụ anọ ikpe n’ebubo imetọ aha ya nakwa isu ya imi n’ịntanetị.

Nwamadị a degaara ndị uweojii akwụkwọ ahụ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprelụ site n’aka ndị ọkaiwu ya gụnyere Peter Abraham, Uche Mathew,Gbenga Agunloye na Anthony Abia.

Cheta n’izuụka gara aga, mmadụ anọ boro ebubo na soshal midia na ọ bụ Nathaniel Bassey mụrụ Mercy Chinwo nwa ya nwoke.

Ebubo ahụ wuru ewu na soshal midia ọkachasị na X

Ndị ọkaiwu ya gwara ndị uweojii ka leba anya n’akwụkwọ mkpesa ahụ ngwa ngwa bụ Bassey gbara megide mmadụ anọ gụnyere Okoronkwo Ejike, Kingsley Ibeh, Terrence Ekot na Dj Spoiltkid.

Cheta na Mercy Chinwo bụkwa onye a ma ama na-eti egwu ụka Kraịst wepụtara foto nwa nwoke nke ya na di ya mụrụ ọhụrụ na Fraịde 29 Maachị 2024 na soshal midia.

Kamgbe ahụ ka ndị a malitere ịkatọ foto nwata ahụ ma kwuo na ihu nwa ahụ yiri nke Nathaniel Bassey.

Leave A Reply

Your email address will not be published.