Take a fresh look at your lifestyle.

Uru Ikoro bara na omenala Igbo

0 304

N’oge gboo n’ala Igbo, mgbe elu ka bụ ala ọsa, e nwere ụfọdụ akụrụngwa ụda ndị Igbo ji agbasa ozi n’obodo nke gụnyere, ekwe, udu, ogene nakwa Ikoro.

Akụrụngwa ndị a nwere ihe mere ha jiri dị iche n’ibe ha, site n’ụda ha, etu ha n’ukwuu nakwa ihe ndị ọzọ.

N’akụkọ a, anyị ga-elebe anya n’ihe banyere akụrụngwa pụrụiche a na-akpọ ‘Ikoro’.

Ihe bụ ikoro

“A na-arụrụ ikoro ụlọ, ọ na-anaghị anọ n’okpuru anwụ maọbụ mmiri.”

Otu onye ọkachamaara n’omenala Igbo bụ Nze Duruagwu bụ akụrụngwa ụda e ji akpọku ọha mmadụ n’obodo ma oke ihe mee – ma nke ọma ma nke ọjọọ.

O kwuru na ụda ikoro na-ama jijiji n’obi nke bụ na a kụọ ya, onye ọbụla nọ n’obodo ga-anụrịrị ụda ya na-agbanyeghi ebe ị nọ.

Nze Duruagwu kwuru na e nwere ụfọdụ obodo ikoro ha na-ebu oke ibu nke bụ na tupu a kụọ ya, a na-eji ubube arịgoro n’elu ya.

“Ikoro dịka arụnsị, a na-atụrụ ụfọdụ n’ime ha aja tupu a kụọ ya. A na-arụrụ ikoro ụlọ, ọ na-anaghị anọ n’okpuru anwụ maọbụ mmiri.”

Duruagwụ kwuru na ọ bụghị mmadụ niile nwereike ịkụ ikoro na onye ahụ na-akwado ọfụma tupu ọ kụọ ikoro.

“Ọ bụghị onye ọbụla nwereike ịkụnwu ikoro, ịkụ ikoro na-esi n’agbụrụ, onye ahụ ga na-asọ ime ihe ọjọọ nsọ.”

“A na-anaghị akụ ikoro na nkịtị ma o nweghi nnukwu ihe dapụtara maọbụ ozi dị mkpa a chọrọ izi ndị obodo.

“Mgbe ọbụla a kụrụ ikoro, ndị obodo niile na-agbakọta n’etiti ama, iji chọpụta nnukwu ihe ahụ mere nụ.

Ihe e ji ikoro eme

Ịkụ ikoro na-esi n’agbụrụ mmadụ, ọ bụghị mmadụ niile nwereike ịkụ ya

Nze Duruagwu tụrụ ilu sị “ọ na-abụ ekwe kụọ ama agbaa”. O kwuru na ọ bụ ikoro ka e ji eme ihe ndị gụnyere;

  • Ịkpọku ọhanaeze obodo ma oke ihe mee maọbụ a chọro ime nnukwu emume n’obodo dịka ichi Eze, Nze na Ọzọr.
  • A na-eji ya ekwupụta ọnwụ nnukwu mmadụ n’obodo dịka ọnwe Eze obodo, ọnwụ onye Ichie, Ezemmụọ na ndị ọzọ.
  • A na-eji ya akpọ oku agha n’oge gboo.
  • E nwereike iji ikoro kpọpụta nnukwu mmọnụ n’obodo, mgbe ahụ a kụọ ya, a na-esi nwaanyị ọbụla maọbụ onye na-etozughi oke ịhụ mmọnwụ ahụ agaghị apụta ezi.

Ndịiche dị n’Ikoro na ekwe

Nze Duruagwụ kwuru na ọ bụ eziokwu na e ji ikoro na ekwe agbasa ozi mana e nwere ndịiche n’etiti ha.

Ikoro buru nnukwu ibu anaghị ebu ya akpagharị akpagharị mana ekwe dị obere.

A na-atụrụ ụfọdụ ikoro aja tupu a kụọ ya mana a naghị atụ aja n’ịkụ ekwe.

Ịkụ ikoro na-esi n’agbụrụ anaghị a họpụta onye ahụ ahọpụta mana e nwereike ịhọpụta onye na-akụ ekwe.

Ihe mere omenala ikoro ji anwụ

“Ikoro dịka arụnsị, a na-atụrụ ya aja tupu a kụọ ya.”

Dịka ọ dị ugbua, omenala iji ikoro agbasa ozi maọbụ ịma ọkwa na-anwụzi anwụ n’ala Igbo ugbua.

Nze Duruagwu kwuru na ihe butere ọnọdụ a gụnyere mbata omenala nwa Bekee butere okpukperechi Kraịst nke mere na ọtụtụ ndị Igbo anaghizi ekwenye n’omenala Igbo.

O kwuru na o meela ụfọdụ na-akpọzi ụlọ ikoro ndị a ọkụ na-emebisi ha, ebe ndị oke ọchịchị na-ezu ikoro ndị a ma na-ere.

Ihe ọzọ bụkwa na tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ emeela ka nzirita ozi maọbụ ịma ọkwa lazie n’ekwentị nke mere na ọ na-arahụ ịhụ ka ndị obodo niile gbakọtara ọnụ maka mkparịtaụka.

Duruagwụ tụrụ arọ kwuo na ọ ga-adị mkpa ka ndị Igbo legharịa anya azụ ma chọpụta ebe ha si ma makụọ ụfọdụ omenala ndị ha gbahapụrụla bụ nke ikoro so n’ime ha.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.