Take a fresh look at your lifestyle.

Ịkwụsị nnata ọgwụ ọgwọgwọ ọrịa kansa bu mmadụ iji aka ya gbuo onwe ya- ndị ọrịa kansa na Naịjịrịa

0 353

Abali ano nke onwa Febụwarị bụ ụbọchị eji echeta ndị ọrịa Kansa n’uwa niile.Kansa egbuola ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na ụwa niile .

Ụfọdụ ndị na-arịa Kansa na Naịjirịa gwara ndi ntaakuko obi ha, ha kwuru na ego ole ana-ere ọgwụ Kansa arịala karịa ka ọ dị bụ.

O doro ọnyeọbụla anya na ego ana-ere ihe niile na Naịjirịa arịala. Ụlọọrụ na-ahụ maka ọgụọnụ ego nke Naịjirịa bụ ‘National Bureau of Statistics’ kwuru na ihe ngalaọnụ na Naịjirịa kwụ na pacentị 28.9 na ọnwa Disemba nke 2023.

Mary bụ onye ọrịa Kansa na-anata ogwụgwọ n’ụlọọgwụ kansa dị na Abuja gwara ndi ntaakuko ‘‘Anaghị m agbadozi anya n’ọgwụgwọ m maka na ego ole ana-ere ọgwụ karịrị, a na ma echekarị echiche etu m ga esi nwete ego ọgwụ m’’

Mary chọpụtara na obu ọrịa ahụ n’afọ 2020, ọ natara ọtụtụ ọgwụgwọ ma nke an-akpọ ‘Chemotherapy’mana ụgbụa, Dokịta ya enyela ya ọgwụ ọzọ ana-akpọ ‘Zoladex’

‘’Na mbụ, otu Zoladex bụ # 60,000 mana ụgbụa ọ nọzị na # 120,000, onwere mgbe m na gbara ọgwụ m n’ihi ahụghị ego, nanị dị m na-ebu ihe niile a maka na anaghị m aru ọrụ’’ Mary kọwara.

Ịkwụsị nnata ọgwụ kansa bu mmadụ iji aka ya gbuo onwe ya- ndị ọrịa kansa na NaịjịrịaImage caption: Ịkwụsị nnata ọgwụ kansa bu mmadụ iji aka ya gbuo onwe ya- ndị ọrịa kansa na Naịjịrịa

Dika osiri kwu, ọgwụ ọzọ ana-enye ndị ọrịa Kansa bụ ‘Zoledronic acid’ arịala ruo #180,000.

‘’Ọgwụ na-ewetulata ụfu m na-azụ bụ #1000 nọzị na #3000 ụgbụa, otu iko vitamin C bụzi #7.500 nke a mere m jiri gbanwee ya zụba nke #2,500’’

‘’N’ime ihe ndị a inweghị ike ịkwụsị nnata ọgwụ gị maka na ị kwụsị ọgwụ bụ mmadụ iji aka ya gbuo onwe ya’’

Amina Abubakar, onye ọrịa Kansa ọzọ bi n’Abuja gwara BBC na otu ọgwụ ọna-azụ bu #5000 eruola #10,500.

‘’Aha ọgwu ahụ bụ Xeloda Capecitabine, dịka onye ọrịa kansa, ị ga anụ sachetị itoolu n’ime ịzuụka atọ eji akwado maka nyocha ‘Chemotheraphy’ nke anyị na-eme otu ugboro n’izuụka atọ’’ Amina kọwara.

Ihe ọpụtara bụ na Amina ga-eji ihe ruru #95,000 zụọ ọgwụ a n’ime izuụka atọ.

‘’Nke kachasị ewute anyị bụ na Gọọmentị anaghị eme ihe ọbụla iji nyere anyị aka, anyi nọọrọ onwe anyị, dịka onye ọrịa kansa na Naịjirịa, ị ga na-eche maka ahụịke gị, ị ga na-echeku etu ị ga-esi nwete ego ị ga-eji zụta ọgwụ ndị a’’

Ndị ọrịa ‘Tuberculosiis na HIV na-enwete ọgwụ ha n’efu na Naịjirịa mana ọ dịghị etu nyere ndị ọrịa kansa. Dịka onye ọrịa kansa, ị nọọrọ onwe gị wee ruo mgbe ị ga-anwụ’’ Amina kwuru.

Etu otu onye ọrịa Kansa siri bee akwa maka ọnụ ego ọgwọ siri rịaImage caption: Etu otu onye ọrịa Kansa siri bee akwa maka ọnụ ego ọgwọ siri rịa

Onyeisi otu enyemaka ndị kansa na Naịjiịa bụ Gloria Orji Nwajiogu kwuru na anatara enyemaka iji wetulata ego ole ana-ere ọgwụ ndị kansa na Naịjirịa na-aka Gọọmetị ugboro ole na ole mana ọnagị ezu.

‘N’ulọọgwụ gọọmentị, anyị na-enweta ndị ọrịa kansaruru mmadụ iri na ise na iri abuo n’otu izuụka, nwere ya manye ihe ụlọọgwụị ndị ọzọ na-enweta’’ Gloria kwuru.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *