Ndị uweojii Ekiti Steeti ekwupụtala na a zọpụtala ụmụakwụkwọ ise ahụ na ndị nkuzi ha a tọọrọ n’Emure-Ekiti Steeti n’abalị iri abuo na itolu nke onwa Jenụwarị 2024.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Abutu Sunday sị na e mere nke site na njikọta aka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ gụnyere Amotekun, ndị nchekwa ọdịnala na ndị dinta.
O kwuru na ozi iti aka n’obi ya na-agara ezinaụlọ onye ọkwọ ụgbọala ụmụakwụkwụ ahụ dịka a na-enye na ndị ntọrị ahụ gburu ya.
Sunday kwuru na ha na-eme nyocha tara ọchịchị iji nwuchie ndị ntọrị ma taa ha ahụhụ dịịrị ha.
Ọ gara n’ihu kwuo na e nyefeela ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi ha a zọpụtara n’aka gọọmentị Ekiti Steeti maka inyocha ha ahụ ma nye ha ọgwụgwọ.
Leave a Reply