Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere mba US na UK jiri atụ ogbunigwe n’ogige ndịagha nnupuisi Houthi

0 354

Mba Amerịka na Briten gbakọtara aka ọnụ ma tụọ ogbunigwe n’ogige 36 nke ndị otu agha nnupuisi Houthi nke mba Iran na-akwado na mba Yemen.

Ogbunigwe ha tụrụ na Satọde ụbọchị atọ nke ọnwa Febụwarị gbatara ọtụtụ ebe ndị otu Houthi na-edosa ngwa ogbunigwe ha dị iche iche.

Nke a abụghị mbụ mba US ba UK ga-agbakọta aka ịtụ ndịagha nnupuisi a ogbunigwe , ha tụrụ ndị a ogbunigwe n’ụbọchị iri na otu nakwa iri abuo na abuo nke ọnwa Jenụwarị 2024.

Kedụ ihe mere ha jiri awakpo ndị Houthi?

N’ọnwa Nọvemba 2024, otu agha nnupuisi Houthi nke nwere nkwado mba Iran malitere ịtụ ogbunigwe n’ụgbọmmiri ndị na-agafe n’oke osimmiri uhie (Red Sea) ma kwuo na ọ bụ ụgbọmmiri ndị na-achọ ịbanye mba Isreal ka ha na-atụ ogbunigwe ndị a.

Otu a kwuru na ha na-eme nke a iji busoo mba Isreal agha maka ihe na-eme otu Hamas n’obodo Gaza.

Mana ọtụtụ ụgbọmmiri ha tụrụ ogbunigwe abụghị nke mba Isreal, o nweghikwa ihe ọbụla jikọtara ha na mba Isreal.

Nke a mere iwe jiri wee mba Amerịka na Briten ha jiri malite ịtụ ndị otu Houthi ogbunigwe aghara aghara na mba Yemen.

N’otu aka ahụ ndị Houthi aṅụọla iyi imegwara ihe a mba Amerịka na Briten mere ha dịka ọtụtụ ogige ha larala n’iyi.

ma sị na mwakpo nke ugboro atọ mba US na UK ga-awakpo ha agaghị egbochi ha ịkwado mba Palestine n’ụzọ ọbụla ha kwesịrị.

Ụfọdụ foto gosikwara ka ndị otu ha na-agbakọta ma na-akwado maka etu ha ga-esi zaghachị mba Amerịka na UK.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *