Take a fresh look at your lifestyle.

Gịnị na-esere gọọmentị Anambra steeti na Igwe Neni?

0 219

Akụkọ gbọwara na mgbede ụbọchị Tuusde bụ na Gọọmentị Anambra steeti akwụsịla ịhụ Igwe Damian dịka Igwe obodo ahụ nke pụtara na akwụsịla ya ọrụ obere oge.

N’ozi nke Komishona na-ahụ maka okwu ọdịnala wepụtara, ọ kọwara ihe nke a ji me.

N’ozi ahụ, ọ si na Igwe Neni dara iwu kpuchiri omume ndị Eze ọdịnala.

“Iwu kpuchiri omume ndị Eze ọdịnala kwuru na o nweghi onye nwere ikike ichi onye esighị n’obodo ya echichi na-anataghị Igwe obodo onye ahụ a na-echi echichi ikike ime nke ahụ” ka ya bụ ozi kwu

Ozi ahụ kwukwara na e kwesiri ịnata ngalaba na-elekọta ihe ọdịnala na steeti ahụ ikike tupu e mee nke a.

“Na ị gara n’ihu chie mmadụ esighị n’obodo gị bụ Sịnetọ Ifeanyi Ubah echichi ezughị oke n’agbanyeghị ihe ọbụla iji mee ya”

Ihe a bụ nkọwa gọọmentị Anambra nyere ha ji kwụsị ya n’ọrụ obere oge.

Ha nyekwara ya ohere ịzara ọnụ ya ma zọọ isi onwe ya na mkpebi a.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.