Take a fresh look at your lifestyle.

NEC ekwupụtala Uzodimma dịka onye meriri na ntuliaka gọvanọ Imo

0 270

Ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission ekwupụtala Hope Uzodimma dịka onye meriri na ntuliaka gọvanọ Imo steeti mere na Satọde abalị iri na otu n’ọnwa Nọvemba, 2023.

Onye na-ahụ maka nlọghachi nke INEC maka steeti Imo na osote onye isi oche nke mahadum Federal Oye-Ekiti, bụ Ọkammụta Abayomi Fashina kwupụtara nke a n’ezigbo elekere 10.09 nke ụtụtụ ụbọchị ụka,abali irir na abuo nke onwa Nọvemba, 2023.

Dika nchoputa nke Fashina kwuputara, onye ndoro-ndoro ochichi All Progressives Congress, APC, Hope Uzodimma, nwetara 540,308, sochiri onye ochichi People’s Democratic Party, Samuel Anyanwu 71,503 ebe Labour Party, LP’s Athan Achonu biara nke ato na onu ogugu. akara nke 64,081.

Ka ọ dị ugbu a, mkpọtụ dara ka e kwupụtachara nsonaazụ ntuliaka ahụ, ọkachasị ndị nnọchi anya pati na-emegide ya bụ ndị chere na nsonaazụ ya egosighi ihe mere n’ezie n’ọgba.

Na nzaghachi maka mmeri ya na ntuliaka, Gọvanọ Imo steeti jara ndị na-ahụ maka ntuliaka mma maka ịhụ na e mere usoro ntuli aka ziri ezi na nnọpụiche.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.