Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị agha jidere ụgbọala na-egbochi ndị otu mba ofesi ọgwụ ọjọọ

0 299

Ndị agha nke 192 Battalion nke ndị agha Naijiria, na-arụ ọrụ na 81 Division Area of Responsibility, kpọchiri otu ndị a na-enyo enyo na ha na-ahụ maka ọgwụ mba ụwa na-ebufe ngwongwo a na-enyo enyo na ọ bụ Cannabis Sativa (Marijuana) na-aga Sango Otta, na steeti Ogun.

Nkwupụta sitere n’aka onye isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze, Brigadier General Onyema Nwachukwu kwuru na ndị agha na-aza ajụjụ maka ọgụgụ isi mere nkwụsị na nyocha n’okporo ụzọ Ajilete dị n’okpuru ọchịchị Yewa South nke steeti Ogun.

N’oge a na-achọgharị ya, ha kpọchiri ma jide gwongworo a na-enyo enyo na-enweghị nọmba Ndebanye aha, nke bu ihe ngwugwu nari ato iri itolu na asaa a na-enyo enyo na ọ bụ wii wii. Na nyocha izizi sochirinụ, ọ chọpụtara na ihe ọjọọ ahụ e zoro n’ime gwongworo ahụ si Ghana bufee Benin Republic site na Igholo-Idiroko, banye Sango Otta.

Ndị a na-enyo enyo na-ebufe ọgwụ ọjọọ a bụ Mazị Matthew Edegbe, onye Benin Republic na Maazị Joshua Dansu nke Idiroko, bụ ndị na-enye aka ugbu a na nyocha na-aga n’ihu.

                                                                                                                                                                                              Ihe ndị e nwetara n’aka ndị a na-enyo enyo gụnyere nọmba ndebanye aha nke gwongworo ahụ nke akpọrọ (T 1826 LA Lagos), bụ nke ewepụrụ wee zoo n’ime ụgbọ ala iji gbochie njirimara, ekwentị Infinix na Itel, otu iphone, kaadị njirimara mba Benin Republic na ikike ịnya ụgbọ ala. nke otu George Benyagbe, yana nchikota puku naira asaa (N7000) naanị.

A kpụpụrụ ndị a na-enyo enyo, ụgbọ ala na ihe ngosi n’ụlọ mkpọrọ, na-eche ka ha nyefee ụlọ ọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA), Lagos State Command.

Cheta na ndị agha Battalion n’abali iri na ise Satọde,nke onwa Julaị 2023, nwụchiri otu gwongworo bu katrijị ngwa agha karịrị puku iri abụọ na-aga Anambra steeti.

Gụọ kwa: Ndị agha na-agbachitere nnukwu ụgbọala bu mgbọ n’okporo ụzọ Anambra steeti Onye isi ndị agha na-ahụ maka ndị agha, Major General Taoreed Lagbaja, etoola ndị agha ahụ maka ntinye ha na ịmụrụ anya ha.

Ọ gwakwara ha ka ha na-agbasi mbọ ike na-ekpochapụ mpụ n’obodo ahụ.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.