Take a fresh look at your lifestyle.

Atụọla Ousmane Sonko nga afọ abụọ na Senegal

0 458

Akụkọ na-eru anyị ntị na-ekwu na Sonko na ndị nkwado ya e boro ebubo agaghị aga mkpọrọ.

Ngagharị iwe amalitela na mpaghara Dakar. Ndị nkwado Sonko na-ebuso ndị nchekwa ọgụ tụmadị ebe Sonko bi.

N’abali mbụ nke ọnwa Juunu ka otu ụlọikpe na Senegal atụọla Ousmane Sonko nga afọ abụọ maka ebubo “imebi ndị ntoroọbịa”.

Ụlọikpe kagburu ebubo idina mmadụ n’ike nakwa iyiegwu ọnwụ e boro Sonko na-azọ ọkwa Onyeisiala na ndọrọndọrọ ọchịchị Senegal nke a ga-eme n’afọ 2024.

Mpụtara ikpe nwerike ime ka Sonko; onye ndị ntoroọbịa hụrụ n’anya nke ukwuu azọzịla ọkwa ọchịchị mba Senegal na ntuliaka ha n’afọ 2024.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *