Take a fresh look at your lifestyle.

NNPC Anabatala Mwepụ Ego Enyemaka Mmanụ Ụgbọala

Chika Eze dere ya na bekee

0 295

Ụlọ ọrụ Nigeria National Petroleum Company NNPC Limited, na-ekwu na ọ nabatalụ mkpebi nke gọọmenti etiti iwepụ ego enyemaka na Premium Motor Spirit, PMS nke pụtara mmanụ ụgbọ ala.

Mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu, onye isi ụlọ ọrụ NNPC Limited, Mallam Melle Kyari na-ekwu na “mwepụ ego enyemaka nke bụ nnukwu ibu dịịrị nnweta ego nke NNPC, ga-eme ka e nwee ọrụ kacha mma n’ụlọ ọrụ ahụ.”

Na nzaghachi maka ụkọ mmanụ enweelarị, Kyari mesiri ndị Naijiria obi ike na ha ga-eweta ngwaahịa zuru oke. O kwuru na “NNPC na-enyochakwa netwọkụ nkesa ya niile iji hụ na ọ dabara.”

Onye isi ala Naijiria ọhụrụ bụ Bola Tinubu, n’okwu mmeghe ya nye mba ahụ n’ụbọchị Mọnde, kwuputara nkagbu ego enyemaka mmanụ ụgbọala na Naijiria.

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *