Ụmụ Amaala Naịjirịa Ejupụtala Eagle Square Maka Idu N’iyi Ọrụ Tinubu.
Cyril Okonkwo dere ya na bekee
Ndị Naijiria ebidola ịbata na Eagle Square dị n’Abuja, ebe a ga-eme mmemme ụbọchị Mọnde bụ Bola Tinubu na osote onyeisiala, Kashim Shettima, n’isi ụtụtụ elekere isii nke ụtụtụ n’oge Naijiria.
Nnukwu mmiri ozuzo n’isi ụtụtụ ụbọchị taa egbochighị ndị mmadụ ịga ebe ahụ.
Ọtụtụ okporo ụzọ na-esi n’akụkụ dị iche iche dị n’Abuja na-aga n’ebe a na-eme ihe omume ahụ bụ nke ndi ọrụ nchekwa kpọchiri ka iji were gbochie nsogbu nchekwa ọ bụla.
Ịbanye ebe ahụ siri ezigbo ike ebe ụlọ ọrụ nchekwa, gụnyere ndị uwe ojii, ndị agha, Department of State Services, DSS, na Nigerian Security and Civil Defence Corps, NSCDC, na-amaja ndị na-abanye n’ebe ahụ.
Ekwesịrị ibido emume a n’elekere iri nke ụtụtụ, oge Naịjirịa.
#Presidentialinauguration2023
#nigeriabettertogether
#May29Presidentialinauguration
#9jaBeta2Geda
Leave a Reply