Take a fresh look at your lifestyle.

Steeti Plateau: Gọvanọ Lalong Ahọpụtala Onyeisi Ọrụ Ọhụrụ

Chigo dere ya n'igbo.

0 260

‍‌‌  Gọvanọ Simon Lalong nke Plateau steeti ahọpụtala Oriakụ Rauta Dakok dịka onye isi ọrụ ọhụrụ na steeti ahụ.

Ekwuputara nhọpụta a na Satọde site na nkwupụta sitere n’aka onye isi mgbasa ozi ọha, Dr Makut Macham, na Jos, isi obodo steeti Plateau.

Dị ka ya si kwuo, Dakok ga-eweghara n’aka Maazị Sunday Hyat bụ onye lara ezumike nká n’ọrụ, na-erute afọ ezumike nká nakwa na ọ rụkwara ọrụ mgbatị ọnwa anọ nke Gọvanọ nyere ya.

Ruo oge nhọpụta ya, Dakok bụ odeakwụkwọ  (General Administration) na Ofisi nke Onye isi ọrụ.

“Onye gụsịrị akwụkwọ  na Mahadum Jos na 1988, Barr. Rauta Dakok malitere ọrụ ya na Gọọmenti Steeti Plateau n’afọ 1990 dịka onye ndụmọdụ steeti.

Leave A Reply

Your email address will not be published.