Kaduna: mela ka In-Vitro Fertilisation (IVF) dịkwuo ọnụ mma.
Ngalaba ụlọ ọgwụ n’ahụ maka ọmụmụ nke Ahmadu Bello University Teaching Hospital (ABUTH), Zaria, e mela ka In-Vitro Fertilisation (IVF) dịkwuo ọnụ mma maka ndị di na nwunye dara ogbenye, site na mmekorita ọha na eze.
In vitro Fertilization (IVF) bụ otu n’ime usoro dị iche iche e nwere iji nyere ndị nwere nsogbu ọmụmụ aka ịmụ nwa. N’oge IVF, a na-ewepụ akwa n’ime akpa nwa nwanyị ma tinye ya na spam na ụlọ nyocha. A na-eweghachi akwa ahụ mgbe ihe eji akpụ nwa nke si n’ ahụnke nwoke banyere ya , A ga-akpọ akwa ahụ embrayo, ọ dizịa n’afọ nwanyị ahụ ka ọ too ma tolite.
Ọkammụta Adebiyi Adesiyun nke ngalaba na-ahụ maka ịmụ nwa nke IVF Project, mere ka a mara nke a na mkparịtaụka ya na ndị nta akụkọ na Tọzdee na Zaria.
Leave a Reply