Take a fresh look at your lifestyle.

IPAC na-achọ nkwado iji kwalite ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria.

Nnenna Okoronkwo dere y a na bekee.

0 236

IPAC na-achọ nkwado iji kwalite ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naijiria.

Inter-Party Advisory Council (IPAC) akpọọla oku ka e nyekwuo nkwado site n’aka ndị mmekọ mmepe n’ịkwalite ikike nke otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Onye isi oche IPAC, Sani Yabagi kwuru nke a mgbe kansụl ahụ na ndị otu mmepe dị iche iche nwere ọgbakọ n’Abuja.

Ndị mmekọ mmepe gụnyere Ụlọ ọrụ Embassy China, International Republican Institute, na National Planning Commission.

Yabagi kwuru na IPAC dị ka otu nche anwụ nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-agba mbọ ịkwalite ezi ọchịchị na mmepe na Naịjirịa.

O kwuru na Naijiria enwebeghị nnukwu ihe n’ihe gbasara SDG, n’agbanyeghị ọtụtụ mbọ gọọmentị na-agba.

Yabagi kwuru na Naijiria enweghị ike ịkwụsị ịda ogbenye, agụụ  ma ọ bụrụ na-etinyeghị aka na mmezu nke SDGs.

 

Ọ kọwara na IPAC na-ezube ileba anya n’ọganihu ndị gọvanọ 36 a họpụtara ahọpụta na mmezu SDG.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *