Take a fresh look at your lifestyle.

Aka ndí uweojii akparala Seun Kuti maka ịda ịwu

0 332

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs Steeti bụ Benjamin Hundeyin ekwuola na aka ha akparala otiegwu Seun Kuti, onye e boro ebubo iti onye uweojii ihe.

Hundeyin kwuru na Seun Kuti ji aka ya bịa n’ụlọọrụ ndị uweojii n’ụtụtụ Mọnde a.

Cheta na onyeisi ndị uweojii bụ Usman Alkali Baba, nyeburu iwu a e jide Mazị Kuti dịka onyonyo pụtara na soshal midia nke gosiri ebe ọ mara onye uweojii aka ntị.

Ọ bụ ihe megidere iwu na Naịjirịa ịkpaso onye ọrụ nchekwa ọbụla agwa ọjọọ, dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa si kwuo.

Amabeghị mgbe a ga-akpụpụ Seun Kuti ụlọikpe maka ebubo a.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *