Naijiria na-anabata ụmụnwaanyị ndị bụ nwunye ndi isi ala nke mba Afrịka na ọgbakọ nke iri ha nwere.
Aisha John-Mark dere ya na bekee.
Naijiria na-anabata ụmụnwaanyị ndị bụ nwunye ndi isi ala nke mba Afrịka na ọgbakọ nke iri ha nwere.
Nwunye onyeisiala Naijiria bụ Aisha Buhari, na Mọnde, ga-anabata ụmụnwaanyị ndị nwunye ndi isi ala nke mba Afrịka n’ọgbakọ nke iri nke African First Ladies Peace Mission (AFLPM) na Abuja.
Nke a dị n’akwụkwọ ozi onye isi mgbasa ozi n’ụlọọrụ nwunye onyeisiala bụ Maazị Suleiman Haruna nyere ndị nta akụkọ n’ụbọchị Satọde n’Abuja.
Haruna kwuru na nwunye onyeisiala ga-ejikwa ohere ahụ wepụta isi ụlọ ọrụ a rụrụ ọhụrụ n’akụkụ okporoụzọ ọdụ ụgbọ elu dị n’Abuja.
O kwuru na mmemme a na-atụ anya na ọ ga-amalite n’ụbọchị Mọnde, Mee 8 ruo Tuzdee, Mee 9.
Dị ka ya si kwuo, a na-atụ anya na mmemme a ga-anabata ndị nnọchiteanya sitere na United Nations, ndị òtù diplomatic corps, African Union na Economic Community of West African States (ECOWAS).
Leave a Reply