N’ọdị nso a, e nweela nrụrịtaụka na soshal midia gbasara mmeri Peter Obi nwetara na Legọs Steeti, bụ ebe Bola Tinubu – onye zọrọ ọkwa onyeisiala na pati APC – chịburu dịka Gọvanọ.
Nrụrịtaụka a bụ gbasara agbụrụ, dịka ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ maka agbụrụ Peter Obi mere ọtụtụ ndị Igbo ji akwado ya.
Ya bụ nrụrịtaụka abanyekwala na ndọrọndọrọ ọkwa Gọvanọ Labour Steeti, ebe Peter Obi na-akwado Gbadebo Rhodes-Vivour nke Labour Party, onye nne ya nakwa nwunye ya bụ ndị Igbo si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Mana Obi kwuru na “ndị na-ewebata okwu gbasara agbụrụ mmadụ na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ndị enweghị ihe ha nwere inye n’ezi ọchịchị obodo.”
“Ndị Yoruba tụọrọ m vootu na Legọs karịrị n’ọnụọgụgụ. Okwu ịkpa oke agbụrụ bụ ihe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ji emesa ndị mmadụ uche ka ha ghara ịjụ ajụjụ ndị dị mkpa ha kwesịrị ịjụ tupu ha atụọ vootu.”
Peter Obi kwuru na ya ọ bụghị iwu na ndị nkwado ya, a na-akpọ ‘Obidient Movement’, ga na-akwadorịrị naanị ‘Labour Party’, ọ kachasị na steeti dị icheiche ebe pati ahụ na-enweghị ndị pụtara ịzọ ọkwa Gọvanọ.
Ntuliaka maka ọkwa gọvanọ steeti nakwa ndị omeiwu steeti ga-adị n’ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị iri na asato nke ọnwa Maachị 2023.
Leave a Reply