Take a fresh look at your lifestyle.

2023: Onye Zọrọ Ọkwa Onyeisiala N’afa LP Ajaala Ndi Naijiria Mma, Gbarụọ Ihu N’usoro Ntuliaka.

Bitrus Kozah dere ya na Bekee

0 331

Onye zọrọ ọkwa Onyeisiala n’afa otu Labour paati bụ Maazị Peter Obi etoola ụmụafọ Naịjirịa ndị pụtara n’igwe isonye na ntuliaka onyeisiala na ndị ọgbakọ omebe iwu e mere n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Febụwarị na nso nso a na Naịjirịa.

Onye ndoro-ndoro Labour paati kwuru na ya ga-agbagha usoro ntuliaka onye isi ala site n’ụzọ iwu iji nwetaghachi ikike ndị mmadụ.

Ọ kpọkuru ndị Naijiria na ndị na-akwado ya ka ha bụrụ ndị na-erube isi n’iwu ma ghara ịkpalite ime ihe ike nakwa na Naijiria Ọhụrụ ga-ekwe omume.

Onye bụbu gọvanọ Anambra Steeti ndịda ọwụwa anyanwụ Naijiria kwuru na ntuliaka ahụ enwezughị ihe ekwesịrị maka ntuliaka nwere ntụkwasị obi.

Ọ kpọkulu ụmụafọ Naịjirịa ka ha pụta ịtụ vootu maka ndị Labour Paati na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ na ndị omebe iwu steeti n’abalị iri na otu nke ọnwa Maachị.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *