Take a fresh look at your lifestyle.
independence

‘Anaghị m emekwa, a na-eyi ndụ m egwu’ – Onyeisi ngụkọ ntuliaka Rivers Steeti

0 340

Onyeisi ngụkọ mpụtara ntuliaka onyeisiala na Rivers Steeti bụ Charles Teddy Adias ekwuola na ya agaghị arụkwa ọrụ ahụ n’ihi na a na-eyi ndụ ya na nke ezinụlọ ya egwu.

Adias kwuru nke a n’ụtụtụ taa bụ Tuzde n’ebe a na-agụkọ ntuliaka na Port harcourt Rivers steeti.

Tupu nke a emee, a kpọpụtala mpụtara ntuliaka n’okpuruọchịchị niile na Rivers steeti ọ fọdụ naanị abụọ – Obio-Akpor na Degema.

Mana Adias kwuru na ya agaghị agazi n’ihu ịkpọpụta mpụtara ndị a ruo mgbe Inec lebara anya n’ozi iyi egwu nke a na-ezitere ya na ezinụlọ ya.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.