Take a fresh look at your lifestyle.

2023 General elections: Ihe ndị ị maghị maka Tinubu, Peter Obi, Kwankwaso na Atiku

0 394

Ihe ndị mmadụ amaghị maka mmadụ anọ kachasị chapụta na ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naijiria na ntuliaka 2023 bụ Atiku Abubakar nke PDP, Bola Tinubu nke APC ,Peter Obi nke Labour Party nakwa Rabiu Kwankwaso nke NNPP adịghị ọtụtụ n’ihi na ha anọ anọọla n’ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị mbụ.

Mana dịka Igbo na-ekwu, ọ bụ onye nọ mmadụ nso na-anụ isi ure eze ya, naanị ndị ezinaụlọ ha, ndị enyị ha na ndị ha rụkọrọ nwere ike ịkọwa kpọmkwem ụdị mmadụ ha bụ na ihe ọha ndị mmadụ amaghị maka ha.

Ọtụtụ ma Bola Ahmed Tinubu na-azo okwa onyeisiala n’aha otu APC dika onye ngukoego na aka chiburu Legos steeti malite n’afo 1999 rue 2007.

A makwa ya dịka onye tuchara ndi dika Okammuta Yemi Osinbajo, Rauf Aregbesola na Baba Tunde Fashola kwuba ha dika ndi okwu ha na-ada na Naijiria.

Mana Babatunde Fashola bụ Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ kọwara na nna ya ukwu bụ Bola Ahmed Tinubu bụ onye ga-abu o kpebie ihe ọ chọrọ ime, o mezu ya, “I kweteghị, o kwetara gị”.

Ọtụtụ Rabiu Kwankwaso na-azo okwa onyeisiala n’aha otu NNPP dika inginia na aka chiburu Kano steeti, mana ọtụtụ amaghị na odogwu a bụ onye ụburu na-acha ọkụ nakwa mmadụ nwere obi ọha.

Alhaji Bashir Nukkel kọwara Rabiou Kwankwaso dịka onye gụrụ akwụkwọ nakwa onye nwere omiko ebe ndị mmadụ nọ.

A ma Peter Obi na-azo okwa onyeisiala n’aha ‘Labour Party’, dika ojiegoachuego na aka chiburu Anambra steeti.

I ma ya dika onye okwu na-adị mma nọ ọnụ ọbụladị malite oge ọ nọ n’ụlọakwụkwọ sekọndrị na CKS Onitsha.ma ahazi okwu bu nka o nwere malite na sekondri. Benjamin Uzoka nwa Klassi obi kwuru na obi bụ onye ma ahazi okwu nakwa onye anaghị emefu efo.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *