Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Naijiria Akwanyerela Hilda Adefarasin Ugwu.

0 475

Onyeisiala Naijiria, Muhammadu Buhari etiela ezinụlọ Adefarasin aka n’obi maka ọnwụ nnukwu nne ha bụ Oriakụ Hilda Adefarasin, ka ọ gbachara afọ iri itoolu na asatọ.

Onyeisiala ahụ chetara mmasị nnukwu nne Adefarasin nwere maka inyere ndị ogbenye na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka nke pụtara ihe n’oge na ndụ ya dị ka onye nọọsụ, ma nọgide na-apụta ihe na ndụ ya dum.

Buhari kwuru na ọrụ ya dị ka onye na-akwado maka ikike ụmụ nwanyị na inye ikike ha kọwara National Council of Women Societies (NCWS), ebe ọ bụ onyeisi oche, na ọkwa ndị ọzọ, ma mee ka Kansul ahụ bụrụ olu kachasị elu maka ịkwado ụmụ nwanyị na Naijiria taa.

Mmetụta Dị Mma

Onye isi ala ahụ gwara ụmụ ya, ọkachasị onyendu ụlọ ụka House on the Rock, Pastọ Paul Adefarasin, ka ha jisie ike na ntọala nne ha tọrọ iji usoro nsọpụrụ Chineke na-eme ihe dị mma maka ihi mmadụ.

Leave A Reply

Your email address will not be published.