Take a fresh look at your lifestyle.

Iran Protest: Ayatollah, onye ọchịchị Iran agbagharala ọtụtụ ndị nọ na nga

0 496

Ụlọikpe kachasí nke mba Iran agbaharala ihe ruru puku pụrụ puku ndị nọ na nga nke gụnyere ndị e boro ebubo megide gọọmentị mba ahụ.

Kama mgbasaozi nke mba ahụ kwuru na ya bụ mgbaghara nke Ayatollah Ali Khamenei nyere ndị a nwere ihe so ya.

Nke a na-eme tupu emee emume eji echeta Islamic Revolution nke mere n’afọ 1979.

Cheta na ebidoro ngagharịiwe na mba Iran n’ọnwa Sepụtemba afọ 2023 dịkaotu nwaanyị nwụrụ n’aka ndị ọrụ nchekwa mama oyighị Hijab etu iwu siri kwuo.

Nke a na-eso akwụkwọ ozi ngalaba Iwu mba ahụ deputara nke kọwara ndị ntoroọbịa anwuchiri oge ngagharịiwe maka hijab bụ ndị mba ofesi na-arafu.

Ya bụ akwụkwọ ozi kwuru na ụfọdụ ndị a anwuchiri oge ngaghariiwe arịọla mgbaghara ma chigharịa.

Kama ndị a na-ebo ebubo ihe ndị ọzọ dịka ịrụrụ mba ndị ọzo ọrụ nyopụ na Iran, ndị eboro ebubo igbu mmadụ na ndị mebiri ihe gọọmentị agaghị agbaghara ha.

Ha kwukwara na mgbaghara a agaghị erute ndị nwere akwụkwọ ikike mba ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *