Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na ‘Labour Party’ bụ Peter Obi arịọla ụmụ Naịjirịa ka ha nwee ndidi maka mgbanwe ego Naịra ọhụrụ nke ụlọakụ etiti mere.
Obi kwuru na ọ bụ eziokwu na ya bụ atụmatụ na-eme ka ihe siere ọtụtụ mmadụ ike ugbua, mana ọ ga-eweta ọdịmma n’ọnọdụ akụnụba Naịjirịa n’ọdịnihu.
O kwuru nke a site n’ozi o wepụtara n’akara Twitter ya n’ụtụtụ sọnde.
“Mgbanwe ego abụghị naanị na Naịjirịa ka ọ na-eme,” Peter Obi kọwara. “Ọ bụ atụmatụ na-anaghị adịcha mfe ma na-ewetakwa ihe ụfụ, mana ọ ga-eweta ọtụtụ ihe uru n’ọdịnihu.
“Ọ bụ eziokwu na enwere ụfọdụ ihe a gaara eme iji mee ka ọ dịwanye mfe, mana ana m arịọ ụmụ Naịjirịa ka ha nweere Ụlọakụ Etiti nakwa Gọọmentị Etiti ndidi, ma nwee nchekwube na onye ọbụla ga-erite uru site n’atụmatụ a n’ọdịnihu.
“Anyị na-akpọkukwa Ụlọakụ Etiti na ụlọakụ dị icheiche ka ha welite aka na mbọ ha na-agba iji hụ na ndị mmadụ nwetara ego ọhụrụ a, ma mekwaa ka o rute ọtụtụ ndị mmadụ na-enweghị akara ọbaego ọbụla aka, ọ kachasị ndị ogbenye na ndị bi n’ime obodo dị icheiche ebe ụlọakụ adịghị.”
Social embed from twitter
KpesaReport this social embed, make a complaint
Ihe isiike n’ihi mgbanwe naịra
Ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa ekwuola etu nhịahụ si n’inweta ego naịra ọhụrụ si mee ka ihe siera ha ike nke ukwuu.
Ụfọdụ ụlọakụ anaghị ekwe enye ndị mmadụ ego ọhụrụ a, n’ihi na ha na-ekwu na ha enweghị ya bụ ego.
Ndị nkịtị na-eji igwe ‘Point of Sale’ (POS) enye ndị mmadụ ego na-anazi oke ọnụ, ọtụtụ n’ime ha enwekwaghị ego ọhụrụ kama ọ bụ ego ochie ka ha na-enye.
Otu onye gwara BBC Igbo na ndị POS nara ya otu puku naịra iji nye ya puku naịra iri; n’oge mbụ ihe ha na-ana maka puku naịra iri bụ narị naịra abụọ.
OnyeisialaMuhammadu Buhari ekwukwaala na ya ma maka nhịahụ ndị mmadụ na-enwe gbasara ego naịra ọhụrụ, mana ya enyela iwu ka ụlọakụ etiti nakwa ụlọakụ ndị ọzọ gbasie mbọ ike ịhụ na ego ọhụrụ rutere ndị mmadụ aka
Leave a Reply